Job 20

Okwu Zofa

1Mgbe ahụ, Zofa onye Neama zara sị:

2“Enweghị udo nke echiche m na-akpali m izaghachi
nʼihi na anọ m na mwute dị ukwuu.
3Anụla m okwu mkparị nke ileda anya nye m,
ma nghọta m na-akpalịte m ịzaghachi gị.

4“Nʼezie, ị maara otu ọ dị site na mgbe ochie,
ya bụ kemgbe e debere mmadụ nʼụwa.
5Obi ụtọ nke onye na-emebi iwu na-adị nwa mgbe nta,
ọṅụ nke ndị na-amaghị Chineke na-anọ naanị nwa oge.
6Nʼagbanyeghị na ịnya isi ya ga-eru eluigwe,
na isi ya ga-emetụkwa igwe ojii;
7ọ ga-ala nʼiyi ebighị ebi, dịka nsị ya onwe ya nyụrụ;
ndị maara ya ga-ajụ, ‘Olee ebe ọ nọ?’
8Ọ ga-efelaga dịka nrọ, agaghị achọtakwa ya mgbe ọbụla,
dịka ọhụ abalị nke e chefuru echefu.
9Anya hụrụ ya na mbụ agaghị ahụkwa ya ọzọ,
ebe obibi ya agaghị elegidekwa ya anya ọzọ.
10Ụmụ ya ga-achọ ihuọma site nʼaka ndị ogbenye;
aka ya abụọ kwa ga-enyeghachi akụ ya.
11Ọkpụkpụ ya nke jupụtara nʼike okorobịa
ga-eso ya bụrụ ihe a ghanyere na ntụ.

12“Ọ bụ ezie na ihe ọjọọ na-atọ ya ụtọ nʼọnụ,
na ọ na-ezokwa ya nʼokpuru ire ya;
13ọ bụ ezie na ọ pụghị nʼịhapụ ya,
ọ na-edebe ya nʼọnụ ya,
14ma nri ọ na-eri ga-aghọ ihe gbara ụka nʼafọ ya,
ọ ga-aghọkwa elo agwọ nʼime afọ ya.
15Ọ ga-agbọpụta akụnụba niile o lodara;
Chineke ga-eme ka o si nʼafọ ya gbọpụtachaa ha.
16Ọ ga-amịcha elo agwọ,
eze agwọ ajụala ga-egbu ya.
17Ọ gaghị anụ ụtọ mmiri si nʼiyi,
bụ iyi nke na-asọ asọ nke jupụtara na mmanụ aṅụ na mmiri ara ehi rahụrụ arahụ.
18Ihe ọ rụpụtara ka ọ ga-eji kwụghachi ụgwọ o ji na-erighị ma otu.
Uru ọ zụtara nʼahịa agaghị abụrụ ya ihe ọṅụ.
19Nʼihi na ọ kpagburu ndị ogbenye, hapụ ha na-enweghị olileanya ọbụla,
ọ nakọtakwara ụlọ nke ọ na-ewughị.

20“Nʼezie, ọ gaghị enwe izuike site nʼoke ọchịchọ ya;
ọ gaghị azọpụtakwa onwe ya site nʼụlọakụ ya.
21Ọ dịghị ihe fọdụụrụ ya iripịa,
ọganihu ya agaghị adịgide.
22Nʼetiti ihe niile o nwere ka mkpagbu ga-abịakwasị ya,
oke ịta ahụhụ ga-adakwasị ya.
23Mgbe o rijuru afọ
ka Chineke ga-eme ka iwe ya dị ọkụ megide ya,
iti aka Chineke ga-adakwasị ya dịka mmiri ozuzo.
24Ọ bụrụ na o si na ngwa agha e ji igwe kpụọ gbalaga,
àkụ nke e ji ọla bronz kpụọ ọnụ ya ga-amapu ya ahụ.
25Nʼazụ ya ka ọ na-esi mịpụta ya,
site nʼumeju ya ka a ga-esi mịpụta ọnụ ya na-egbu amụma.
Oke egwu dị iche iche ga-abịakwasị ya.
26Oke ọchịchịrị nọ na-echere akụnụba ya,
ọkụ nke a na-afụnwughị afụnwu ga-erepịa ya
ọ ga-erechapụkwa ihe niile fọdụrụ nʼụlọ ikwu ya.
27Eluigwe ga-ekpughe ikpe ọmụma ya
ụwa niile ga-ebili megide ya.
28Idee mmiri ga-ebupu ụlọ ya;
oke mmiri okwukwo nʼụbọchị iwe Chineke.
29Nke a bụ oke nke Chineke debeere ndị na-emebi iwu,
ya bụkwa ihe nketa nke Chineke kwadooro ha.”
Copyright information for IboBIU